Job 42

Okwu Job

1Mgbe ahụ, Job zara Onyenwe anyị sị:

2“Amara m na ị pụrụ ime ihe niile;
ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa.
3Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’
Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị,
ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata.

4“Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu;
m ga-ajụ gị ajụjụ,
gị onwe gị ga-azakwa m.’
5Ntị m nụrụ ihe banyere gị
ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.
6Ya mere, ana m akpọ onwe m asị,
na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.”

Okwu mmechi

7Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru. 8Ugbu a, werenụ oke ehi asaa na ebule asaa, jekwuru ohu m bụ Job ka o jiri ha chụọrọ unu aja nsure ọkụ, ohu m bụ Job ga-ekpekwara unu ekpere. Aga m anabatakwa ekpere ọ ga-ekpe nʼihi unu. Agaghị m alakwa unu nʼiyi nʼihi okwu nzuzu unu. Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m dịka ohu m Job si kwuo.” 9Ya mere, Elifaz onye Teman, na Bildad, onye Shu, na Zofa, onye Naaman mere dịka Onyenwe anyị si nye ha nʼiwu. Onyenwe anyị nabatakwara ekpere nke Job kpere nʼihi ndị enyi ya.

10Mgbe Job kpesịrị ekpere maka ndị enyi ya, Onyenwe anyị mekwara ka ọ baa ụba ọzọ. O nyekwara ya okpukpo abụọ nke ihe niile o nwere na mbụ. 11Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom, na ndị enyi ya niile bịara soro ya rie oriri nʼụlọ ya, na-akasị ya obi nʼihi iru ụjụ ya niile. Ha kasịkwara ya obi nʼihi ọnwụnwa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya. Ha niile nʼotu nʼotu nyere ya onyinye ọlaọcha na mgbaaka ọlaedo.

12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu. 13Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ. 14Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk. 15Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere.

16Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ. 17Job nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.

Copyright information for IboBIU